We Believe JesusFé, Esperança e Nova Vida

Aịzaya 66

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · ib

← Aịzaya 65 Aịzaya

1Ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-ekwu,

2Ọ bụghị aka m mere ihe ndị a niile,

3Ma onye ọbụla nke na-achụ aja ehi

4Ya mere, aga m ezitere ha ahụhụ dị egwu,

5Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị,

6Ọ bụ gịnị bụ mkpọtụ dị nʼime obodo?

7“Tupu ime amalite ime ya,

8Onye jiri ntị ya nụtụ ihe dị otu a mbụ?

9Mụ onwe m, m ga-eme ka nwa rute nʼoge ọmụmụ

10“Soronụ Jerusalem ṅụrịa ọṅụ, soronụ ya nwee obi ụtọ,

11Nʼihi na ihe banyere Jerusalem ga-atọ unu ụtọ.

12Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,

13Dịka nne si akasị nwa ya obi,

14Mgbe ị hụrụ ihe ndị a, obi gị ga-aṅụrị ọṅụ,

15Nʼihi na lee, Onyenwe anyị ga-eji ọkụ bịa.

16Nʼihi na Onyenwe anyị ga-eji ọkụ na mma agha ya

17“Ndị ahụ niile na-edo onwe ha nsọ, ndị na-eme onwe ha ka ha dị ọcha nʼihi ịbanye nʼubi a gbara ogige, ndị ahụ na-eso onye ahụ nọ nʼetiti ndị ahụ na-eri anụ ezi, na oke, na ihe ndị ọzọ ahụ niile rụrụ arụ, ga-ezute ọnwụ nke nọ na-eche ha niile.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

18“Ma mụ onwe m, amaara m nke ọma ihe ha zubere ma meekwa, ana m abịa ịchịkọta mba niile na-asụ asụsụ dị iche iche. Ha niile ga-abịakwa hụ ebube m.

19“Aga m edokwa ihe ịrịbama nʼetiti ha, zipụkwa ndị fọdụrụ ndụ nʼetiti ha ka ha gaa nʼobodo Tashish, na Libiya,66:19 Ụfọdụ akwụkwọ mgbe ochie na-ede Put ma ndị Hibru na-ede Pul na Lidiya66:19 Maọbụ, ndị Lud (ndị na-agba àkụ nʼụta nke ọma) na Tubal, na Griis. E, ha ga-eje na mba niile nke dị anya, nʼofe osimiri, ebe ndị bi nʼime ya na-anụbeghị ihe banyere ịdị ukwuu nke m, maọbụ hụ ebube m. Ha ga-ekwusakwa ihe banyere ebube m nʼetiti mba niile dị iche iche.

20Ha ga-akpọghachi ụmụnne unu niile site na mba niile, bịa nʼugwu nsọ m dị na Jerusalem, dịka onyinye a na-ewetara Onyenwe anyị. Ha ga-ebute ha nʼelu ịnyịnya, nʼụgbọ agha, nʼelu ụgbọala a na-adọkpụ adọkpụ, nʼelu ịnyịnya muul na nʼelu ịnyịnya kamel,” ka Onyenwe anyị na-ekwu. “Ha ga-ebubata ha dịka mgbe ndị Izrel na-ewebata onyinye mkpụrụ ha nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nʼefere mmemme dị ọcha.

21Aga m ahọrọkwa ụfọdụ ka ha bụrụ ndị nchụaja na ndị Livayị,” ka Onyenwe anyị kwuru.

22“Dịka eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ahụ nke m ga-eke ga-esi dịgide nʼihu m, otu a ka aha unu na agbụrụ unu ga-adịgide, ka Onyenwe anyị kwubiri.

23Ọ ga-abụkwa na site nʼotu Ọnwa ọhụrụ ruo nke ọzọ, sitekwa nʼotu ụbọchị izuike ruo na nke ọzọ ya, anụ ahụ niile bụ mmadụ ga-abịa, daa, kpọọ isiala nʼihu m,” ka Onyenwe anyị kwuru.

24“Ha ga-apụ, jee, lekwasị ozu ndị ahụ niile nwụrụ anwụ anya, bụ ndị ahụ niile nupuru isi megide m. Nʼihi na ikpuru ha agaghị anwụ anwụ, ọkụ a kwanyere agakwaghị anyụ anyụ. Ha ga-abụkwara mmadụ niile ihe na-asọ oyi.”

← Aịzaya 65 Aịzaya