We Believe JesusFé, Esperança e Nova Vida

Aịzaya 6

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · ib

← Aịzaya 5 Aịzaya Aịzaya 7 →

1Nʼafọ ahụ, mgbe eze bụ Ụzaya nwụrụ, ahụrụ m Onyenwe anyị ka ọ nọ nʼocheeze ya dị oke elu. Ọnụ ọnụ ala uwe ya jupụtara ụlọnsọ ukwuu ya.

2Ndị na-erugharị nʼelu ocheeze ya bụ ndị mmụọ ozi a na-akpọ seraf, ndị nwere nku isii. Ha ji nku ha abụọ kpuchie ihu ha; abụọ ka ha ji kpuchie ụkwụ ha, abụọ nke fọdụrụ ka ha ji na-efegharị.

3Ha na-abụrịtara onwe ha abụ, sị,

4Nʼihi ụda olu ha, ọnụ ụzọ na mgbidi ụlọnsọ mara jijiji, ụlọ ahụ jupụtara nʼanwụrụ ọkụ.

5Etiri m mkpu akwa sị. “Ewoo! Onye nwụrụ anwụ ka m bụ, nʼihi na onye mmehie ka m bụ, egbugbere ọnụ m bụ egbugbere ọnụ rụrụ arụ; ọ bụkwa nʼetiti ndị egbugbere ọnụ ha rụrụ arụ ka m bi. Ugbu a, ejirila m anya m hụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụ Eze ukwu ahụ!”

6Mgbe ahụ, otu nʼime seraf ndị ahụ sitere nʼebe ọ nọ fekwute m, were mkpa gụta otu icheku dị ọkụ site nʼebe ịchụ aja.6:6 Ebe ịchụ aja a, nke dị nʼetiti ebe nsọ ahụ, ka a na-achụ aja ụda ndị ahụ na-esi isi ụtọ Mkp 8:3

7O weere icheku ọkụ ahụ sọtụ m nʼọnụ, sị m, “Ugbu a, a gụọla gị dịka onye dị ọcha, nʼihi na icheku a emetụla gị nʼọnụ. A gbagharakwala gị mmehie gị niile.”

8Mgbe ahụ, anụrụ m olu Onyenwe anyị ka ọ na-ajụ, “Onye ka m ga-eziga? Onye ga-ejekwara anyị?”

9Ọ siri, “Gaa gwa ndị a sị,

10Mee ka obi ndị a maa abụba, dịkwa arọ,6:10 Abụ 119:70; Ọrụ 7:51

11Ma ekwuru m sị, “Onyenwe m, ọ bụ ruo ole mgbe?”

12Ọ bụ ruo mgbe Onyenwe anyị zigara onye ọbụla gaa ebe dị anya,

13Ma ọ bụrụkwa na otu ụzọ nʼime ụzọ iri nʼime ha niile afọdụ nʼala a,

← Aịzaya 5 Aịzaya Aịzaya 7 →