1Nʼụbọchị ahụ, ọzara na ala kpọrọ nkụ ga-enwe obi ụtọ;
2ọ ga-agbawa ifuru jupụta;
3Meenụ ka aka ndị ahụ kụdara akụda dịkwa ike,
4Gwanụ ndị ahụ na-atụ egwu sị ha,
5Mgbe ọ bịara, ọ ga-emeghe anya ndị kpuru ìsì,
6Ọ ga-eme ka onye ngwụrọ wulie elu dịka ele,
7Elu ala ahụ na-ere ọkụ nʼụkwụ ga-aghọ ọdọ mmiri.
8Okporoụzọ ga-adịkwa nʼebe ahụ,
9Ọdụm agaghị anọ nso ụzọ ahụ.
10Ma ndị ahụ Onyenwe anyị gbapụtara ga-alọtakwa.