1Nke a bụ amụma megide Ijipt:
2“Aga m akpali ndị Ijipt mee ka ha lụọ ọgụ nʼetiti onwe ha.
3Ndị Ijipt ga-ada mba nʼime mmụọ ha,
4Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ekwuola ya sị,
5Mmiri dị nʼosimiri ga-atada;
6Ụzọ niile osimiri Ijipt ahụ si asọgharị
7Ahịhịa ndụ niile dị nʼakụkụ Naịl ga-akpọnwụ,
8Ndị ọkụ azụ ga-asụ ude, kwaa ụwa,
9Ndị nʼarụ ọrụ flakisi etiri eti ga-eru ụjụ,
10Obi ụtọ agaghị adịkwara ndị na-esite nʼịkpa akwa enweta ego,
11Naanị ndị nzuzu ka ndịisi Zoan bụ,
12Ebee ka ndị ikom gị ahụ maara ihe nọ ugbu a?
13Ndịisi obodo Zoan aghọọla ndị nzuzu,
14Onyenwe anyị awụnyela nʼime ha
15Ọ dịghị ihe Ijipt nwere ike ime,
16Nʼụbọchị ahụ, ndị ikom Ijipt ga-adị ka ndị inyom, ha ga na-ama jijiji nʼegwu nʼihi aka ahụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile weliri elu imegide ha.
17Ala Juda ga-ewetara ndị Ijipt oke egwu, oke ụjọ ga-atụ onye ọbụla akpọtaara aha Juda, nʼihi ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ezube megide ha.
18Nʼụbọchị ahụ, obodo ise nʼime ala Ijipt ga-asụ asụsụ Kenan, ṅụọ iyi irubere Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile isi. Otu nʼime obodo ndị a ka a ga-akpọ Obodo anwụ.
19Nʼụbọchị ahụ, ebe ịchụrụ Onyenwe anyị aja ga-adị nʼetiti ala Ijipt.19:19 Jen 28:18; Ọpụ 24:4; Jos 22:10,26,27 A ga-ewukwa otu ogidi ncheta nye Onyenwe anyị nʼoke ala ha.
20Nke a ga-abụ ihe ama na ihe ngosi, na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọkwa nʼIjipt. Mgbe ha kpọkuru Onyenwe anyị maka ndị na-emegbu ha, ọ ga-aza ha, ọ ga-ezitere ha onye nzọpụta, onye ga-azọpụta ha.
21Ya mere, Onyenwe anyị ga-eme ka ndị Ijipt mara onye ọ bụ, nʼụbọchị ahụ, ha ga-amata Onyenwe anyị, jirikwa ịchụ aja na onyinye fee ya. Ha ga-ekwe Onyenwe anyị nkwa debekwa ya.
22Onyenwe anyị ga-eti Ijipt ihe otiti, ma ọ ga-agwọkwa ha. Ndị Ijipt ga-alọghachikwute Onyenwe anyị, ọ ga-aṅakwa ntị nʼarịrịọ ha gwọọkwa ha.
23Nʼụbọchị ahụ, a ga-enwe okporoụzọ atụliri atụli nke ga-esite na Ijipt ruo Asịrịa. Ndị Asịrịa ga-aga Ijipt, ndị Ijipt ga-agakwa Asịrịa, ndị Ijipt na ndị Asịrịa ga-eso fee ofufe.
24Nʼụbọchị ahụ ka Izrel ga-abụ nke atọ imezu Ijipt na Asịrịa, bụrụ ngọzị nʼụwa.
25Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-agọzi ha, na-asị, “Ka ngọzị dịrị Ijipt, ndị m, dịrị Asịrịa nke bụ akaọrụ m, na Izrel ihe nketa nke m.”