1Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
2“Nwa nke mmadụ, gwa eze Taịa, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị:
3Ị maara ihe karịa Daniel?
4I werela amamihe gị na nghọta gị
5E, mmụta nʼịzụ ahịa gị
6“ ‘Ya mere, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu;
7ana m aga ịkpọbata ndị mba ọzọ megide gị,
8Ha ga-eme ka ị rịdaruo nʼolulu nke ala mmụọ.
9Mgbe nke a mere, ị ga-asị, “Mụ onwe m bụ chi,”
10Ị ga-anwụ ọnwụ dịka ndị a na-ebighị ugwu,
11Okwu nke Onyenwe anyị rutere m ntị, sị,
12“Nwa nke mmadụ, bulie abụ akwa banyere eze Taịa ma gwa ya, ‘Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,
13Ị nọ nʼIden,
14Ahọpụtara m gị mee gị ka ị bụrụ cherub,
15Ị bụ onye na-enweghị ịta ụta
16Site nʼịba ụba nke ọzụzụ ahịa gị
17Obi gị jupụtara na nganga
18Nʼihi ọtụtụ mmehie gị, na ịzụ ahịa aghụghọ gị,
19Ndị niile maara gị
20Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
21“Nwa nke mmadụ, chee ihu nʼebe Saịdọn dị buo amụma megide ya,
22ma kwuo, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,
23Aga m ezite ajọ ọrịa na-efe efe, nke ga-emegide ya,
24“ ‘Ụlọ Izrel agaghị enwekwa mba kpọrọ ha asị gbara ha gburugburu ndị dịka uke, nke na-adụ adụ, na ogwu nke na-egbu mgbu. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.
25“ ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ndị Izrel ga-alọghachi biri nʼala nke aka ha ọzọ, ala nke m nyere nna ha Jekọb ohu m. Nʼihi na aga m esite na mba niile ha gbasasịrị chịkọtaa ha, si otu a gosi mba niile nke ụwa ịdị nsọ m.
26Ha ga-ebi nʼala a na ntụkwasị obi. Ha ga-ewu ụlọ, kụọ ubi vaịnị, birikwa na-atụghị egwu ọbụla. Mgbe m pịachara mba niile dị ha gburugburu ụtarị, bụ mba ndị ahụ mekpara ha ahụ, mgbe ahụ, ha ga-amata nʼezie na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke ha.’ ”