We Believe JesusFé, Esperança e Nova Vida

Izikiel 27

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · ib

← Izikiel 26 Izikiel Izikiel 28 →

1Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

2“Nwa nke mmadụ, bulie abụ akwa banyere Taịa,

3sị ya, gị oke obodo dị nʼọnụ oke osimiri, onye bụ onye ahịa nke mba niile dị nʼọnụ osimiri. ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru:

4I meela ka oke ala gị dịrị nʼetiti oke osimiri.

5Osisi e ji wuo ahụ ụgbọ gị

6Osisi ook nke si Bashan

7Ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, nke e si Ijipt bubata,

8Ndị ikom si Saịdọn na Avad bụ ndị na-akwọrọ gị ụgbọ mmiri gị.

9Ndị okenye na ndị nka Gebal a maara aha ha nọ nʼime ụgbọ mmiri gị.

10“ ‘Ndị ikom Peshịa na Lidiya,27:10 Maọbụ, Lud na Put,

11Ndị ikom Avad, na Helek

12“ ‘Tashish bụ onye ahịa gị, nʼihi ịba ụba nke akụ gị. Ọ bụ ọlaọcha na igwe, na gbamgbam, na opu, ka ha ji akwụ gị ụgwọ ihe ha si nʼaka gị zụrụ.

13“ ‘Ndị Griis,27:13 Maọbụ, Javan Tubal na Meshek, bụkwa ndị ahịa gị. Ha na-ebutere gị ndị ohu, na ihe e ji bronz kpụọ, iji kwụọ gị ụgwọ ihe ha si nʼaka gị zụrụ.

14“ ‘Otu a kwa ndị ikom Bet Togama jikwa ịnyịnya ụgbọ, na ịnyịnya agha, na ịnyịnya ibu na-agbanwere27:14 Nke a bụ nʼọnọdụ ịkwụ ụgwọ, mgbe ụfọdụ ọ bụrụ na mmadụ ejighị ego, o nwere ike jiri ihe o nwere kwụọ ụgwọ ihe ọ zuru, site nʼụzọ ịgbanwere ihe. ihe ha zụrụ.

15“ ‘Ndị ahịa si na Dedan bụkwa ndị ahịa gị. Otu a kwa ọtụtụ ndị bi nʼọnụ mmiri bụkwa ndị ahịa gị. Ha ji ọdụ, na osisi eboni kwụọ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị.

16“ ‘Ndị Aram ka gị na ha zụrụ ahịa nʼihi ọtụtụ ngwa ahịa gị. Ha na-ejikwa nkume dị oke ọnụ tọkwọisi na akwa e sijiri esiji odo odo, na akwa a kpara nke ọma, na ezi akwa ọcha, na koral, na nkume oke ọnụahịa rubi na-akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị.

17“ ‘Ndị Juda na ndị Izrel niile bụkwa ndị ahịa gị. Ha na-eji ọka wiiti nke si nʼobodo Minit, ya na shuga, na mmanụ aṅụ, na mmanụ, na mmanụ otite na-akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị.

18“ ‘Damaskọs bụkwa ndị ahịa gị, nʼihi ọtụtụ ngwa ahịa na ụba ihe ndị ị nwere ire ere. Ọ bụkwa mmanya si Helbon, na ajị anụ dị ọcha nke esi Zaha weta,

19na mmanya a gbara nʼudu nʼudu nke si Ụzal, na igwe nwupụrụ enwupụ, na kashia, na kalamus, ka ha ji akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị.

20“ ‘Dedan bụ onye ahịa gị nʼakwa a na-agbasa nʼelu ịnyịnya anọkwasị ọdụ.

21“ ‘Arebịa na ụmụ eze niile nke Keda bụkwa ndị ahịa gị. Ọ bụ ụmụ atụrụ, na ebule, na mkpi, ka gị na ha nʼazụrịta na-erekwa.

22“ ‘Ndị ahịa Sheba, na Raama, bụkwa ndị ahịa gị. Ha ji ụda dị iche iche na nkume dị oke ọnụahịa, na ọlaedo akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ.

23“ ‘Ndị Haran, Kanne na Eden, na ndị ahịa Sheba, Ashọ na Kilmad, bụ ndị gị na ha zụkọrọ ahịa.

24Ha na-eweta uwe mara mma dị iche iche, na akwa e tejiri anụnụ anụnụ, na akwa a kpara nke ọma, na kapeeti mara mma dị iche iche, nke e ji ụdọ kpazie nke ọma, nke e tejiri nʼụdị dịkwa iche iche nʼọma ahịa gị.

25“ ‘Ụgbọ mmiri niile nke Tashish

26Ndị na-anyagharị ụgbọ mmiri gị

27Akụ gị niile, na ngwa ahịa gị niile, na ihe ịzụ ahịa gị niile,

28Ala niile dị nʼọnụ mmiri ga-ama jijiji

29Ndị niile na-anya ụgbọ mmiri,

30Ha ga-eti mkpu akwa,

31Ha ga-akpụchapụ agịrị isi ha,

32Mgbe ha ga na-eti mkpu akwa na-erikwa uju nʼihi gị,

33Mgbe e si nʼime gị na-ebupụsị ihe ahịa gị,

34Ugbu a, mmiri e riela gị,

35Ihe ndị a niile ga-eju ndị bi nʼala ọnụ mmiri

36Ndị ahịa nke mba dị iche iche na-efufe isi ha,

← Izikiel 26 Izikiel Izikiel 28 →