We Believe JesusFé, Esperança e Nova Vida

Ekiliziastis 8

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · ib

← Ekiliziastis 7 Ekiliziastis Ekiliziastis 9 →

1Onye dị ka onye amamihe?

2Asị m, debe iwu eze, nʼihi iyi ị ṅụrụ nʼihu Chineke.8:2 Ọtụtụ oge, ndị ọchịchị na ndịisi obodo na-aṅụ iyi nʼihu ndị ọkaikpe, ndị ụkọchukwu nakwa ọha obodo, na ha ga-abụ ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼije ozi ha. Ọ bụ ya ka a na-ekwu nʼebe.

3Emela ngwangwa isi nʼihu eze pụọ. Akwagidela ihe ọjọọ nʼihi na ọ ga-eme ihe masịrị ya.

4Nʼihi na okwu eze nwere ike ọ dịghị onye pụrụ ịjụ ya, Gịnị ka ị na-eme?

5Onye na-edebe iwu eze agaghị adaba na nsogbu.

6Ihe niile nwere oge kwesiri ya, ụzọ e si eme ha dịkwa,

7Ebe ọ bụ na o nweghị onye mara ihe na-aga ime,

8Ọ dịghị onye nwere ike igbochi mmụọ mmadụ8:8 Maọbụ, ifufe mgbe ọ chọrọ.

9Ihe ndị a niile ka m hụrụ, mgbe m na-atụgharị uche banyere ihe niile a na-eme nʼokpuru anyanwụ. Mgbe ụfọdụ, mmadụ na-emegide ibe ya si otu a wetara onwe ya nsogbu.

10Ọzọkwa, ahụrụ m ebe e liri ndị ajọ omume, ndị na-abata na apụkwa site nʼebe dị nsọ, a na-etokwa ha nʼobodo ebe ha mere ihe ndị a. Nke a bụkwa nnọọ ihe na-enweghị isi; ihe efu.

11Nʼihi na e nyeghị ntaramahụhụ mmehie mgbe o kwesiri, obi ndị mmadụ na-ejupụta nʼatụmatụ ime mmehie.

12Onye ajọ omume nwere ike mee narị mmehie bikwaa ogologo ndụ, ma amara m na ọ ga-adịrị ndị na-atụ egwu Chineke mma karịa, bụ ndị na-atụ egwu nʼihu Chineke.

13Nʼihi na ndị ajọ omume adịghị atụ egwu Chineke, ọ gaghị adịrị ha na mma, ụbọchị ndụ ha agaghị agbatịkwa ogologo dịka onyinyo.

14Ọ dị ihe ọzọ na-enweghị isi nʼụwa: ndị ezi omume na-anata ntaramahụhụ dịrị ndị na-emebi iwu. Ndị na-emebi iwu na-anata ụgwọ ọrụ ruru ndị ezi omume. Nʼezie, ihe ndị a niile bụ ihe efu, ha enweghị isi.

15Ya mere, ana m ekwupụta, na ikpori ezi ndụ dị mma, nʼihi na ọ dịghị ihe ka mma nye mmadụ nʼokpuru anyanwụ, karịa iri, na ịṅụ, na inwe obi ụtọ. Mgbe ahụ ọ ga-enwe obi ụtọ nʼọrụ ọ na-arụ nʼụbọchị niile nke Chineke nyere ya nʼokpuru anyanwụ.

16Mgbe m wepụtara obi m ịchọ amamihe na ịghọta ọrụ mmadụ nʼokpuru anyanwụ nke mere na ọ naghị ehi ụra ehihie na abalị,

17mgbe ahụ ka m chọpụtara ihe Chineke mere. O nweghị onye pụrụ ịghọta ihe na-aga nʼokpuru anyanwụ. Otu ọbụla mmadụ siri gbalịa o nweghị ike ịchọpụta ihe ọ pụtara. Onye maara ihe pụrụ ị sị na a amatala ya, ma nʼezie ọ maghị ya.

← Ekiliziastis 7 Ekiliziastis Ekiliziastis 9 →