1Livayị mụrụ ndị a:
2Kohat mụrụ
3Amram mụrụ
4Elieza mụrụ Finehaz;
5Abishua bụ nna Buki,
6Uzi mụrụ Zerahaya,
7Meraiot mụrụ Amaraya,
8Ahitub mụrụ Zadọk,
9Ahimaaz mụrụ Azaraya,
10Johanan mụrụ Azaraya
11Azaraya mụrụ Amaraya,
12Ahitub mụrụ Zadọk,
13Shalum mụrụ Hilkaya,
14Azaraya mụrụ Seraya,
15A dọtara Jehozadak nʼagha mgbe Onyenwe anyị mere ka Nebukadneza dọkpụrụ ndị Juda na Jerusalem nʼagha.
16Ụmụ ndị ikom Livayị bụ,
17Geshọm mụrụ
18Ụmụ Kohat bụ
19Merari mụtara
20Ikwu Geshọm bụ
21Joa,
22Ikwu Kohat bụ
23Elkena,
24Tahat, Uriel,
25Ụmụ ụmụ Elkena bụ
26Ụmụ ụmụ Ahimot bụ
27Eliab,
28Ụmụ Samuel bụ
29Ụmụ ụmụ Merari bụ
30Shimea, Hagiya
31Ndị a bụ ndị ikom Devid họpụtara nye ọrụ ilekọta ndị ọbụ abụ nʼụlọ Onyenwe anyị mgbe e bubatara igbe ọgbụgba ndụ nʼebe ahụ.
32Ha jere ozi ịbụ abụ ha nʼihu ụlọ ikwu, ya bụ, ụlọ nzute, tutu ruo mgbe Solomọn wuchara ụlọnsọ Onyenwe anyị na Jerusalem. Ha jere ozi ha dịka usoro ije ozi ha si dị.
33Ndị a bụ ndị ikom ahụ jere ozi, ha na ụmụ ha ndị ikom:
34nwa Elkena, nwa Jeroham,
35nwa Zuf, nwa Elkena,
36nwa Elkena, nwa Juel,
37nwa Tahat, nwa Asịa,
38nwa Izha, nwa Kohat,
39Asaf onye na-enyere Heman aka, na-eje ozi nʼakụkụ aka nri ya.
40nwa Maikel, nwa Baaseya,
41nwa Etni,
42nwa Etan, nwa Zima,
43nwa Jahat,
44Onye ọzọ na-enyere Heman aka bụ Etan, onye ikwu Merari. Ọ na-anọ nʼaka ekpe ya.
45nwa Hashabaya,
46nwa Amzi, nwa Bani,
47nwa Mahali,
48Ụmụnna ha ndị Livayị ụfọdụ ka e tinyere nʼọrụ dị iche iche nʼụlọ ikwu, bụ ụlọ Chineke.
49Ma Erọn na ụmụ ụmụ ya bụ ndị chụrụ aja onyinye nʼelu ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, nakwa nʼelu ebe ịchụ aja ihe na-esi isi ụtọ, nke metụtara ọrụ ije ozi niile nʼime Ebe ahụ Kachasị Nsọ, na-ekpuchikwara Izrel mmehie niile ha, nʼusoro dịka ihe niile si dị nke Mosis ohu Chineke nyere nʼiwu.
50Ụmụ ụmụ Erọn bụ
51na Buki,
52na Meraiot, na Amaraya,
53na Zadọk,
54Ndị a bụ ala na obodo dị iche iche ụmụ Erọn ketara, nke e nyere ikwu Kohat, ụmụ ụmụ Erọn, nʼihi na ọ bụ ha ka e bu ụzọ kenye oke site nʼife nza.
55Hebrọn, nʼime Juda, ya na ala ịta nri anụ ụlọ niile dị ya gburugburu.
56Ma ala ubi na obodo nta niile gbara Hebrọn gburugburu ka e nyere Kaleb nwa Jefune.
57Ya mere e nyere ụmụ ụmụ Erọn Hebrọn (obodo mgbaba), na Libna, na Jatịa, na Eshtemoa,
58na Hilen, na Debịa,
59na Ashan, na Juta, na Bet-Shemesh, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha.
60Site nʼebo Benjamin e nyere ha obodo Gibiọn, Geba, Alemet, na Anatot, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha.
61E fere nza tupu e nye ndị fọdụrụ nʼime ikwu Kohat obodo iri site nʼala ọkara ebo Manase.
62E fekwara nza nye agbụrụ niile dị nʼikwu Geshọm obodo iri na atọ na Bashan, site nʼala ebo Isaka, na Asha, na Naftalị, na agbụrụ niile dị nʼikwu Manase.
63E fekwara nza nye ikwu Merari obodo iri na abụọ site nʼala ebo Ruben, na Gad, na Zebụlọn.
64Otu a ka ndị Izrel si nye ndị Livayị obodo ndị a na ebe ịta nri nke anụ ụlọ dị.
65Site nʼebo Juda, na Simiọn, na Benjamin ka e si kenye ha obodo ndị ahụ a kpọrọ aha ha na mbụ.
66E sitere nʼala ndị ebo Ifrem kenye ụfọdụ nʼime ndị agbụrụ Kohat obodo ụfọdụ.
67Nʼala ugwu ugwu Ifrem e kenyere ha Shekem (obodo mgbaba), na Gaza,
68na Jokmeam, na Bet-Horon,
69na Aijalon, na, Gat Rimọn, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ gbara ya gburugburu.
70Site nʼọkara ebo Manase, ndị Izrel nyere ndị ikwu Kohat fọdụrụ obodo ndị a: Anea na Bileam, tinyere ala ebe ịta nri anụ ụlọ ha.
71Ndị Geshọm natara obodo ndị a:
72Ebo Isaka nyere ha Kedesh, Daberat,
73Ramọt na Anem, tinyere ebe ịta nri anụ ụlọ niile dị ha gburugburu.
74Ebo Asha nyere ha Mashal, Abdon,
75Hukọk na Rehob, tinyere ebe ịta nri anụ ụlọ niile dị ha gburugburu.
76Ebo Naftalị nyere ha Kedesh nʼime Galili, Hamọn na Kiriatem, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha.
77Ndị ebo Zebụlọn nyere ụmụ Merari ndị Livayị fọdụrụ ala ndị a:
78Ma nʼofe osimiri Jọdan, nʼọwụwa anyanwụ obodo Jeriko, ndị ebo Ruben nyere ha obodo Beza dị nʼọzara, nyekwa ha Jahaz,
79Kedemot na Mefaat, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha niile.
80Ndị ebo Gad nyere ha Ramọt nke Gilead, Mahanaim,
81Heshbọn na Jeza, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha niile.