1Belam sịrị, “Wuoro m ebe ịchụ aja asaa nʼebe a. Kwadokwaara m oke ehi asaa na ebule asaa.”
2Balak mezuru dịka Belam gwara ya. Ha abụọ gburu otu oke ehi na otu nwa ebule nʼebe ịchụ aja asaa ahụ nʼotu na otu.
3Mgbe ahụ, Belam gwara Balak sị, “Guzoro nʼebe a nʼakụkụ aja gị ka m gaa nʼihu chọpụta ma eleghị anya Onyenwe anyị ga-ezute m. Aga m agwa gị ihe ọbụla o kpughere m.” Ya mere, Belam rigooro nʼebe ọhịa na-adịghị.
4Chineke zutere ya nʼebe ahụ. Belam gwara ya sị, “Edoziela m ebe ịchụ aja asaa, gbukwaa otu oke ehi na otu ebule nʼelu ha niile nʼotu na otu.”
5Nʼoge a, Onyenwe anyị tinyere Belam ozi nʼọnụ sị ya, “Laghachi gaa zie Balak ozi a.”
6Mgbe Belam lọghachiri ọ hụrụ ya ka o guzoro nʼakụkụ ihe aja ya ndị ahụ, ya na ndịisi Moab niile.
7Nke a bụ ozi Belam ziri:
8M ga-esi aṅaa bụọ
9Esitela m nʼelu nkume ndị a hụ ha.
10Onye pụrụ ịgụta ole uzuzu Jekọb dị?
11Balak sịrị Belam, “Gịnị bụ ihe a i mere m? Akpọtara m gị ka ị bụọrọ m ndị iro m ọnụ, ma ugbu a, ọ dịghị ihe ọzọ i mere karịa naanị ịgọzi ha!”
12Ma Belam zaghachiri sị ya, “Ọ bụghị ihe Onyenwe anyị tinyere m nʼọnụ ka m ga-ekwu?”
13Mgbe ahụ, Balak sịrị ya, “Soro m bịa nʼebe ọzọ ebe ị ga-ahụ ha; ọ bụ naanị nsọtụ ọmụma ụlọ ikwu ha ka ị ga-ahụ, ị gaghị ahụ ha niile. Site nʼebe ahụ bụọrọ m ha ọnụ.”
14Ya mere, eze Balak duuru Belam gaa nʼọhịa Zofim, nʼelu ugwu Pisga, wuo ebe ịchụ aja asaa nʼebe ahụ. O jikwa otu oke ehi, otu oke ehi, na otu ebule, otu ebule, chụọ aja nʼebe ịchụ aja ndị ahụ.
15Belam sịrị Balak, “Guzoro nʼebe a nʼakụkụ ihe aja gị, ebe mụ onwe m ga-ezute ya nʼofe nke ọzọ.”
16Ma Onyenwe anyị zutere Belam gwa ya ihe ọ ga-ekwu sị ya, “Laghachikwuru Balak zie ya ozi a.”
17Ya mere, ọ lọghachiri azụ nʼebe ahụ Balak na ụmụ eze Moab guzoro nʼakụkụ ihe aja ha. Balak jụrụ ya sị, “Gịnị ka Onyenwe anyị sịrị?”
18Ma Belam zaghachiri sị ya:
19Chineke agaghị agha ụgha, nʼihi na ọ bụghị mmadụ.
20Chineke enyela m iwu sị m gọzie ha.
21“O nweghị ajọ ihe nke ahụrụ nʼime Jekọb,
22Chineke kpọpụtara ha site nʼIjipt.
23Ọ dịghị mgbaasị ga-emegide ha.
24Ha na-ebili ọtọ dịka nne ọdụm,
25Mgbe ahụ, Balak sịrị Belam, “Abụla ha ọnụ ma ọlị, ma ọ bụkwanụ gọzie ha ma ọlị.”
26Ma Belam zaghachiri, “Ọ bụ na m agwaghị gị, ihe ọbụla nke Onyenwe anyị ga-ekwu ka m ga-eme?”
27Mgbe ahụ, Balak sịrị Belam, “Bịa, aga m akpọrọ gị gaa nʼebe ọzọ. Eleghị anya ọ ga-amasị Chineke ka i si nʼebe ahụ bụọrọ m ha ọnụ.”
28Ya mere, Balak duuru Belam gaa nʼelu ugwu Peoa nke na-elegide ọzara ahụ anya.
29Belam gwara Balak okwu sị ya, “Wuoro m ebe ịchụ aja asaa ọzọ. Doziekwa ụmụ oke ehi asaa na ebule asaa e ji achụ aja.”
30Balak mere dịka Belam gwara ya. O ji otu oke ehi na otu ebule chụọ aja nʼebe ịchụ aja ahụ nʼotu na otu.