1Nke a bụ ndekọ usoro ọmụmụ Jisọs onye bụ Kraịst, nwa Devid, nwa Ebraham.
2Ebraham mụrụ Aịzik,
3Juda mụtara Perez na Zera site na Tama,
4Aram mụrụ Aminadab,
5Salmọn bụ nna Boaz, site na nwunye ya Rehab,
6Jesi amụọ Devid, bụ eze.
7Solomọn mụrụ Rehoboam,
8Esa mụrụ Jehoshafat,
9Ụzaịa mụrụ Jotam,
10Hezekaya mụrụ Manase,
11Mgbe e mere ka ha gaa biri nʼala Babilọn ka Josaya mụrụ Jekonaya na ụmụnne ya.
12Mgbe ha si Babilọn lọta
13Zerubabel mụrụ Abiud,
14Azoa mụrụ Zadọk,
15Eliud mụrụ Elieza,
16Jekọb mụrụ Josef onye bụ di Meri nne Jisọs, onye a na-akpọ Kraịst.
17Ya mere, site nʼEbraham ruo na Devid, e nwere ọgbọ iri na anọ. Ma site nʼoge Devid ruo mgbe a dọọrọ ha nʼagha gaa Babilọn, e nwere ọgbọ iri na anọ. Sitekwanụ nʼoge ahụ ruo mgbe a mụrụ Kraịst bụkwa ọgbọ iri na anọ.
18Otu a ka ọmụmụ Jisọs, onye a na-akpọ Kraịst1:18 Maọbụ, Onye nzọpụta siri dị: Nne ya Meri bụ onye e kwenyere na ọ ga-alụ Josef, ma tupu ha ebikọọ ọnụ a chọpụtara na Meri di ime site na Mmụọ Nsọ.
19Ma Josef di ya bụ onye ezi omume, ọ chọghị imenye ya ihere, nʼihi ya, o zubere ịchụ ya na nzuzo.
20Mgbe Josef nwechara mkpebi a, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere ya na nrọ sị ya, “Josef nwa Devid, atụla egwu ịkpọrọ Meri ka ọ bụrụ nwunye gị, nʼihi na nwa ahụ ọ dị ime ya sitere nʼike Mmụọ Nsọ.
21Ọ ga-amụkwa nwa nwoke, onye ị ga-akpọ aha ya Jisọs,1:21 Jisọs nke a bụ otu ndị Griik si akpọ Joshua nke pụtara Onyenwe anyị na-azọpụta. nʼihi na ọ ga-azọpụta ndị nke ya site na mmehie ha.”
22Ihe ndị a mere iji mezuo ihe ahụ Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ onye amụma ya sị,
23“Lee, nwaagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ha ga-akpọ aha ya Ịmanụel”1:23 Aịz 7:14 (nke bụ ma asụgharịa ya, “Chineke nọnyeere anyị”).
24Mgbe Josef si nʼụra teta, o mere dịka mmụọ ozi Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu. Ọ kpọọrọ Meri ka ọ bụrụ nwunye ya.
25Ma ha abụọ edinakọghị tutu ruo mgbe ọ mụsịrị nwa nwoke, onye ọ kpọrọ aha ya Jisọs.