1Mgbe ahụ Elihu sịrị:
2“Nụrụ okwu m, unu ndị amamihe;
3Ntị na-anwale okwu dịka
4Ka anyị chọpụtara onwe anyị ihe ziri ezi;
5“Job na-asị, ‘Abụ m onye ezi omume,
6Ọ bụ eziokwu na aka m dị ọcha
7Olee nwoke dịka Job,
8Ya na ndị na-eme ajọ ihe bụ enyi,
9Nʼihi na ọ na-asị, ‘Ọ dịghị uru dị ya
10“Ya mere, geenụ m ntị, unu ndị ikom nwere nghọta.
11Ọ na-akwụghachi onye ọbụla dịka ihe o mere si dị,
12Ọ bụ ihe a na-ekwesighị iche nʼuche na Chineke pụrụ ime ihe na-ezighị ezi,
13Onye họpụtara ya ịchị ụwa?
14Ọ bụrụ na ọ bụ ebumnuche ya
15mmadụ niile ga-alakọta nʼiyi,
16“Ọ bụrụ na i nwere nghọta, nụrụ nke a;
17Ọ pụrụ ịchị bụ onye ahụ kpọrọ ikpe ziri ezi asị?
18Ọ bụghị ya na-agwa ndị eze okwu sị, ‘Unu abaghị uru,’
19Onye na-adịghị ekpe ikpe mmegide34:19 Dit 10:17; Rom 2:11 nye ụmụ ndị ikom eze,
20Nʼotu ntabi anya, ha na-anwụ nʼime etiti abalị;
21“Anya ya na-elekwasị ụzọ niile nke ụmụ mmadụ;
22Ọ dịghị ọchịchịrị dị, ọ dịghịkwa oke ọchịchịrị dị,
23Ọ dịghị mkpa ọ dịịrị Chineke ịga nʼihu inyocha ụmụ mmadụ,
24Na-ajụghị ajụjụ Chineke na-akụtu ndị a maara aha ha
25Nʼihi na ọ na-agụkọ ọrụ ha niile,
26Nʼebe mmadụ niile ga-ahụ ha ka ọ na-ata ha ahụhụ
27nʼihi na ha sitere nʼiso ya wezuga onwe ha,
28Ha mere ka iti mkpu akwa nke ndị ogbenye ruo ya ntị,
29Ma ọ bụrụ na ọ gba nkịtị, onye ga-ama ya ikpe?
30igbochi nwoke na-adịghị atụ egwu Chineke ịchị obodo,
31“Ọ bụrụ na mmadụ a sị Chineke,
32Biko, zi m ihe ndị ahụ m na-apụghị34:32 Maọbụ, amaghị ịhụ;
33Chineke ọ ga-akwụghachi gị ụgwọ ọrụ site na mkpebi34:33 Ya bụ, nrọpụta gị
34“Ndị ikom ndị nwere nghọta na-ekwu si,
35‘Job na-ekwu okwu dịka onye na-amaghị ihe;
36Ọ ga-adị nnọọ mma ma a sị na a nwaa Job ruo nsọtụ
37Ọ na-atụkwasị nnupu isi nʼelu mmehie ya;