We Believe JesusFé, Esperança e Nova Vida

Joshua 19

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · ib

← Joshua 18 Joshua Joshua 20 →

1Ndị nke abụọ sitere nʼife nza nweta oke ha bụ ebo Simiọn dịka ikwu ha si dị. Ala ha ketara dị nʼime ala e kenyere ndị Juda.

2Ihe nketa ụmụ Simiọn bụ ndị a:

3Haza Shual, Bala, Ezem,

4Eltolad, Betul, Homa,

5Ziklag, Bet-Makabot, Haza Susa,

6Bet-Lebaot na Sharuhen, obodo iri na atọ na obodo nta ndị ọzọ gbara ha gburugburu.

7Na Ain, Rimọn, Eta na Ashan, obodo anọ na obodo nta ha,

8tinyekwara obodo nta ndị ọzọ niile gbara obodo ukwu ndị a gburugburu, ruo obodo Baalat-Bịa, ya bụ (obodo Rema dị na Negev).

9E sitere nʼoke ụmụ Juda wepụta oke ụmụ Simiọn, nʼihi na ihe ụmụ Juda ketara dị ukwuu karịa ihe ha kwesiri iketa. Ọ bụ nke a mere ụmụ Simiọn ji nweta ihe nketa site nʼetiti ala ndị Juda.

10Ebo nke atọ nwetara ihe nketa ha site nʼife nza bụ ebo Zebụlọn dịka ikwu ha si dị.

11Site nʼebe ahụ, oke ala ahụ gbatịrị gaa nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, ruo Marala na Dabeshet, rukwaa iyi dị nʼihu Jokneam.

12O si na Sarid chigharịa ihu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, oke ala ahụ ruru nʼoke ala Kislọt Teboa, gbagorokwa ruo Daberat, ruokwa Jafia.

13Ọ gbatịkwara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ruo Gat Hefa, Et Kazin na Rimọn, tụgharịa nʼụzọ e si aga Nea.

14Nʼebe ahụ, ọ gara gburugburu nʼakụkụ ugwu ruo Hanatọn, ruokwa na Ndagwurugwu Ifta El ebe ọ sọtụrụ.

15Obodo ndị a niile dịkwa nʼime ihe nketa ụmụ Zebụlọn: Katat, Nahalal, Shịmrọn, Idala na Betlehem.19:15 Obodo Betlehem nke a, dị iche na Betlehem dị na Juda. 1Sa 17:12; Rut 1:1 Obodo niile ndị a dị iri na abụọ, tinyere obodo nta niile gbara ha gburugburu.

16Obodo ndị a niile na obodo nta ha, so nʼala ụmụ Zebụlọn nwetara dịka ihe nketa ha, dịka ikwu ha si dị.

17Ebo nke anọ sitere nʼife nza nweta ihe nketa ha bụ ụmụ Isaka dịka ikwu ha si dị.

18Ala na obodo ha ketara bụ ndị a:

19Hafaraim, na Shịọn, Anaharat,

20Rabit, Kishiọn, Ebez na

21Remet, En-Ganim, En-Hada na Bet-Pazez.

22Oke ala ha ruru na Taboa, Shahazuma na Bet-Shemesh, ma kwụsị nʼosimiri Jọdan.

23Ya mere, obodo ukwu ndị a na obodo nta ha dị nʼala ahụ ebo Isaka nwetara dịka ihe nketa ha, dị ka ikwu ha si dị.

24Ebo nke ise e kenyere ala site nʼife nza bụ ụmụ Asha dịka ikwu ha si dị.

25Ala na obodo ha ketara bụ ndị a:

26Alamelek, Amad na Mishal. Oke ala ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ gbatịrị ruo Kamel na Shihoa-Libnat.

27O sitere nʼebe ahụ tụgharịa nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ gawa Bet-Dagọn, ma ruokwa Zebụlọn na Ndagwurugwu Ifta El, ma gbagoro ruokwa Bet-Emek na Neiel. O sikwa nʼebe ahụ gafee, ruo Kabul, nʼakụkụ aka ekpe.

28Ọ gara ruo Ebrọn, Rehob, Hamọn na Kana, ruokwa ebe obodo Saịdọn gbasapụrụ.

29Oke ala ahụ mere dịka ọ na-alaghachi azụ bịaruo Rema, ruokwa obodo e wusiri ike bụ Taịa, tụgharịakwa gawa Hosa pụta nʼọnụ mmiri osimiri Mediterenịa nke dị nʼakụkụ Akzib

30na Umma, Afek na Rehob.

31Obodo ndị a na obodo nta ha niile dị nʼala ahụ ebo Asha nwetara dịka ihe nketa, dịka ikwu ha si dị.

32Ebo nke isii e nyere ihe nketa site nʼife nza bụ ebo Naftalị, dịka ikwu ha si dị.

33Oke ala ha malitere na Helef ruo nʼosisi ukwu dị na Zaananim, Adami Nekeb na Jabneel, gafee ruo Lakum, kwụsị nʼosimiri Jọdan.

34Site nʼebe ahụ oke ala ha gara nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ruo Aznot Tabo, site nʼebe ahụ ruo Hukọk, rute Zebụlọn na ndịda, na Asha nʼọdịda anyanwụ, ruokwa Juda nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jọdan.

35Obodo niile e wusiri ike e kenyere ha bụ ndị a: Zidim, Zea, Hamat, Rakat, Kineret,

36Adama, Rema, Hazọ,

37Kedesh, Edrei, En-Hazoa,

38Iron,19:38 Maọbụ, Yiron Migdal El, Horem, Bet-Anat na Bet-Shemesh.

39Obodo ndị a na obodo nta ha niile ka ebo Naftalị dịka ikwu ha si dị, nwetara dịka ihe nketa ha.

40Site nʼife nza ebo Dan, bụ ebo nke asaa nwetara ihe nketa dịka ikwu ha si dị.

41Oke ala ihe nketa ha bụ ndị a:

42Shaalabin, Aijalon, Itla,

43Elọn, Timna, Ekrọn,

44Elteke, Gibeton, Baalat,

45Jehud, Bene-Berak, Gat Rimọn,

46Me-Jakọn na Rakọn, obodo dị nʼoke ala, na ncherita ihu Jopa.

47Mgbe oke ala ụmụ Dan ketara sitere nʼaka ha pụọ. Ha gara buso obodo Leshem agha merie ha, were mma agha tigbuo ndị niile bi nʼime ya, bichie ya. Ha kpọrọ obodo ahụ Dan, nke bụ aha nna nna ha ochie.

48Obodo ndị a na obodo nta ha bụ ihe nketa ebo Dan nwetara dịka ikwu ha si dị.

49Mgbe e kechara ala ahụ niile, nye ebo ọbụla ala dịka ọnụọgụgụ ha niile si dị, ụmụ Izrel nyere Joshua, nwa Nun ihe nketa ha nʼetiti ha.

50Nʼihi na Onyenwe anyị ekwuola na Joshua nwere ike iwere ala ọbụla ọ chọrọ. Ya mere, ha nyere Joshua obodo Timnat Sera nke dị nʼugwu Ifrem. Joshua wugharịrị obodo ahụ biri nʼime ya.

51Ndị a bụ oke ala nke Elieza onye nchụaja, Joshua nwa Nun na ndịisi ụlọ ebo ụmụ Izrel, kere na Shaịlo site nʼife nza nʼihu Onyenwe anyị, nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Ha si otu a kebie ala ahụ.

← Joshua 18 Joshua Joshua 20 →