We Believe JesusFé, Esperança e Nova Vida

Joshua 16

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · ib

← Joshua 15 Joshua Joshua 17 →

1Ala e kenyere ụmụ ụmụ Josef bidoro nʼosimiri Jọdan nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jeriko gbatịrị ruo nʼọzara. O sitere na Jeriko gbagoo ala ugwu ugwu ahụ, ruokwa Betel.

2O sitekwara Betel (ya bụ Luz), gafee ruo Atarọt, ebe ndị Akai bi.

3Site nʼebe ahụ, ọ gbatịrị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ rute ala ndị Jaflet, ruo ala mgbada mgbada Bet-Horon. O si nʼebe ahụ ruo Gaza, tutu kwụsị nʼosimiri Mediterenịa.

4Ụmụ Josef bụ Ifrem, na Manase nwetara ihe nketa ha.

5Ndị a bụ ala nke ikwu dị iche iche dị nʼebo Ifrem nwetara.

6sitekwa nʼebe ahụ ruo nʼosimiri Mediterenịa. Oke ala ha nʼakụkụ ugwu malitere na Mikmetat, gafee nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ruo Taanat Shaịlo, gafee ya ruo na Janoa.

7O sitere na Janoa gbadaa ruo Atarọt, na Naara, bịaruo Jeriko, gafee, kwụsị nʼosimiri Jọdan.

8Oke ala ahụ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ sitere na Tapụọa gaa ruo iyi Kana, na ruo nʼosimiri Mediterenịa. Nke a bụ ala ebo Ifrem ketara, dịka ikwu ha si dị.

9E tinyere obodo ukwu na obodo nta niile ekepụtara iche nʼihi ebo Ifrem nʼetiti ihe nketa ụmụ Manase.

10Ma ha achụpụghị ndị Kenan ndị bi na Gaza.16:10 Jos 15:63; 17:12-13; Nkp 1:29 Nʼihi nke a, ndị Kenan binyere ndị Ifrem ruo taa, ma e mere ka ha bụrụ ndị ọrụ ngo.

← Joshua 15 Joshua Joshua 17 →