We Believe JesusFé, Esperança e Nova Vida

Joshua 12

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · ib

← Joshua 11 Joshua Joshua 13 →

1Ndị a bụ ndị eze ala ndị ahụ ndị Izrel lara nʼiyi, bụ ala ndị ahụ ha nwetara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan. Obodo niile a lara nʼiyi bụ ndị dị site na ndagwurugwu iyi Anọn ruo nʼugwu Hemon ha na akụkụ ọwụwa anyanwụ Araba.

2Saịhọn, eze ndị Amọrait, onye bi na Heshbọn.

3Ọ bụkwa Saịhọn na-achị akụkụ ọwụwa anyanwụ Araba site nʼosimiri Kineret ruo nʼosimiri Araba (ya bụ, Osimiri Nnu), ruo Bet-Jeshimọt, gbadaakwa akụkụ ndịda ndịda ruo na mgbada ugwu Pisga.

4Ha merikwara Ọg, eze Bashan, onye bụ otu nʼime ndị eze ikpeazụ ndị agbụrụ Refaim. Isi alaeze ya dị nʼAshtarọt na Edrei.

5Ọ chịrị nʼugwu Hemon, Saleka, ala Bashan niile ruo nʼoke ha na ndị Geshua na Maaka nwere, nakwa ọkara nke Gilead, bụ oke ala Saịhọn, bụ eze Heshbọn.

6Ọ bụ Mosis onyeozi Onyenwe anyị, na ụmụ Izrel, lara eze abụọ ndị a nʼiyi. Mosis nyekwara ebo Ruben, na ebo Gad, na ọkara ebo Manase ala ha.

7Ndị a bụ aha ndị eze niile Joshua na ụmụ Izrel meriri, nʼofe osimiri Jọdan, nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, site na Baal-Gad nke dị na ndagwurugwu Lebanọn, ruo nʼugwu Halak nke dị na mgbago nʼụzọ Sia. Joshua nyere ebo Izrel niile ala ha ndị a dịka ihe nketa, nʼusoro dịka ebo ha si dị.

8Ala ndị ọzọ bụkwa ala ugwu ugwu ahụ, na ala dị na mgbada ugwu ọdịda anyanwụ, na ala Araba, na ala ndị dị na mgbada ugwu, na ọzara, nakwa Negev. Ndị a bụ ala ndị Het, na ndị Amọrait, na ndị Kenan, ndị Periz, na ndị Hiv, na ndị Jebus.

9Eze Jeriko, otu

10eze Jerusalem, otu

11Eze Jamut, otu

12eze Eglọn, otu

13eze Debịa, otu

14eze Homa, otu

15eze Libna, otu

16eze Makeda, otu

17eze Tapụọa, otu

18eze Afek, otu

19eze Madọn, otu

20eze Shịmrọn Meron, otu

21eze Teanak, otu

22eze Kedesh, otu

23eze Doa, (nʼime obodo Naftod), otu

24eze Tịaza, otu.

← Joshua 11 Joshua Joshua 13 →