1Job gakwara nʼihu nʼokwu ya sị:
2“Ọ gaara adị m nọọ mma ma a sị na m ga-adị dịka m dị nʼọnwa ole na ole gara aga,
3mgbe oriọna ya na-achakwasị m nʼisi
4Ewoo, otu ihe dịịrị nʼụbọchị ihe na-agara m nke ọma,
5mgbe Onye pụrụ ime ihe niile nọnyeere m
6mgbe ụzọ m jupụtara na mmiri ara ehi rahụrụ arahụ,
7“Mgbe m na-apụ nʼọnụ ụzọ ama obodo
8Ụmụ okorobịa na-ahụ m wezuga onwe ha,
9ndịisi ọchịchị obodo na-akwụsị ikwu okwu
10olu ndị a na-asọpụrụ na-adakwa jụụ,
11Nʼoge ahụ, onye ọbụla nụrụ olu m na-ekwu ihe dị mma banyere m,
12Nʼihi na anapụtara m ndị ogbenye na-eti mkpu enyemaka,
13Onye nọ nʼọnụ ọnwụ gọziri m;
14Ana m eyikwasị ezi omume dịka uwe,
15Abụ m anya nye onye ìsì,
16Abụ m nna nke onye nọ na mkpa;
17Etijiri m ikiri eze nke ndị ajọ omume,
18“Echere m sị, ‘Aga m anwụ nʼụlọ nke aka m,
19Mgbọrọgwụ m ga-eto rịda na mmiri,
20Nsọpụrụ m ga-adịgide ọhụrụ nʼime m,
21“Ụmụ mmadụ na-eji oke olileanya na-ege m ntị,
22Mgbe m kwụsịrị okwu, ha anaghị ekwukwa ọzọ.
23Ha na-echerekwa m dịka e si echere mmiri ozuzo,
24Mgbe m miiri ha ọnụ ọchị, ha adịghị ekwenye ya;
25Ọ bụ m na-ahọpụtara ha ụzọ, na-anọdụ dịka onyeisi ha;