1Ma Job gakwara nʼihu nʼokwu ya sị:
2“Nʼezie, dịka Chineke na-adị ndụ, onye jụrụ ikpere m ikpe ziri ezi,
3Ogologo mgbe m nwere ndụ nʼime m,
4egbugbere ọnụ m agaghị ekwu ihe ọjọọ,
5Agaghị m ekwenye na ihe unu kwuru ziri ezi;
6Aga m ejigidesi ezi omume m aka ike, agaghị m ahapụ ya;
7“Ka ndị iro m dịrị ka ndị ajọ omume,
8Nʼihi nke a, gịnị bụ olileanya onye na-amaghị Chineke nwere mgbe e bipụrụ ya,
9Chineke ọ na-anụ ịkwa akwa ya
10Ọ ga-achọta ihe ụtọ nʼime Onye pụrụ ime ihe niile?
11“Aga m akụziri unu maka ike nke Chineke;
12Unu onwe unu ahụla ihe ndị a,
13“Nke a bụ oke Chineke na-ekenye ndị ajọ omume,
14Nʼagbanyeghị ọnụọgụgụ ụmụ ya, oke ha bụ mma agha;
15Ọrịa na-efe efe ga-egbu ndị ya fọrọ ndụ;
16Ọ bụrụ na ọ kpakọta ọlaọcha dịka uzuzu,
17ihe ndị ọ kpakọtara bụ onye ezi omume ga-eyi ha,
18Ụlọ o wuru dị ka ụlọ nla,
19Ọ na-edina ala dịka ọgaranya ma ọ gaghị edinakwa dịka ọgaranya ọzọ;
20Oke egwu na-adakwasị ya dịka idee mmiri;
21Ifufe si nʼọwụwa anyanwụ na-ebufu ya, agaghị ahụkwa ya anya ọzọ;
22Ọ na-atụfu ya na-enweghị ebere
23Ọ na-akụkọta aka ya nʼịkwa emo,