1Mgbe ahụ, Job zara:
2“Nʼezie, naanị unu bụ ndị maara ihe,
3Ma enwere m mmụọ iche uche dịka unu;
4“Abụzi m ihe ọchị nʼebe ndị enyi m nọ,
5Ndị na-enweghị nsogbu na-eleda ndị ọdachi dakwasịrị anya
6Ụlọ ikwu nke ndị na-apụnara mmadụ ihe na-adị jụụ;
7“Ma jụọ ụmụ anụmanụ, ha ga-akụziri gị,
8Ma ọ bụkwanụ gwa ala okwu, ọ ga-akụziri gị,
9Olee otu nʼime ihe ndị a nke na-amaghị
10Nʼaka ya ka ndụ ihe niile e kere eke dị,
11Ọ bụ na ntị adịghị anwale okwu,
12Ọ bụ na-adịghị ahụ amamihe nʼetiti ndị okenye?
13“Ọ bụ Chineke nwe amamihe na ike,
14Ihe o tidara enweghị mwugharị ọzọ;
15Ọ bụrụ na o gbochie mmiri, ebe niile atakọrọchaa.
16Nʼaka ya ka ike na nzube ihe dị;
17Ọ na-anapụ ndị ndụmọdụ ọkwa ha chụpụ ha,
18Ọ na-atọpụ mkpọrọ igwe ndị eze kere,
19Ọ na-agbawa ndị nchụaja ọtọ chụpụ ha,
20Ọ na-emechi ọnụ ndị ndụmọdụ a tụkwasịrị obi,
21Ọ na-eji ndị ọgaranya eme ihe ọchị,
22Ọ na-ekpughe ihe omimi nke ọchịchịrị
23Ọ na-eme ka mba dị ukwuu, ọ na-emekwa ka ha laa nʼiyi;
24Ọ na-anapụ ndị ndu nke ụwa amamihe ha,
25Ha na-asọgharị ìsì nʼọchịchịrị na-enweghị ìhè.