We Believe JesusFé, Esperança e Nova Vida

Aịzaya 38

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · ib

← Aịzaya 37 Aịzaya Aịzaya 39 →

1Nʼoge ahụ, Hezekaya rịara ọrịa ruo na ọ gaara anwụ. Aịzaya onye amụma, nwa Emọz, bịakwutere ya, sị ya, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị: Dozie ezinaụlọ gị, nʼihi na ị ga-anwụ. Ị gaghị esite nʼute ọrịa a bilie.”

2Hezekaya tụgharịrị chee ihu ya nʼaja ụlọ kpee ekpere nye Onyenwe anyị sị,

3“Chetakwa, Onyenwe anyị, otu m si jegharịa nʼihu gị nʼikwesị ntụkwasị obi, jiri obi m niile fee gị ofufe, ma meekwa ihe dị mma nʼanya gị.” Hezekaya bekwara akwa nke ukwuu.

4Mgbe ahụ, okwu nke Onyenwe anyị rutere Aịzaya,

5“Gaa, gwa Hezekaya, sị ‘Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Chineke nna gị Devid kwuru, anụla m ekpere gị, ahụkwala m anya mmiri akwa gị. Aga m atụkwasị afọ iri na ise nʼụbọchị ndụ gị.

6Aga m anapụtakwa gị na obodo a site nʼaka eze Asịrịa. Aga m echebe obodo a.

7“ ‘Nke a bụ ihe ịrịbama site nʼaka Onyenwe anyị nye gị, na Onyenwe anyị ga-emezu ihe a nke o kwere na nkwa.

8Aga m eme ka anyanwụ laa azụ nzọ ụkwụ iri nʼihe nrigo ụlọ elu Ehaz.’ ” Ya mere, anyanwụ laghachiri azụ nzọ ụkwụ iri.

9Ederede Hezekaya eze Juda, mgbe ọrịachara ọrịa, nwee ahụ ike:

10Asịrị m, “Ọ bụ nʼoge m bụ okorobịa

11Asịrị m, “Ọ dịkwaghị mgbe m ga-ahụ Onyenwe anyị ọzọ

12Esila nʼọnọdụ ya bupụ ụlọ m

13Enwere m ntachiobi chere chi ọbụbọ.

14Dịka eleke maọbụ ụgbala ka m na-ebe akwa.

15Ma gịnị ka m ga-ekwu?

16Onyenwe anyị, ọ bụ nʼihi ihe ndị a ka mmadụ ji adị ndụ.

17Nʼezie, ọ bụ nʼihi ọdịmma m,

18Nʼihi nʼala mmụọ agaghị eto gị,

19Ọ bụ ndị dị ndụ, e, naanị ndị dị ndụ ga-eto gị otuto,

20Onyenwe anyị ga-azọpụta m,

21Aịzaya ekwuolarị sị, “Kwadoonụ mmanụ fiig dị ọkụ tee ya nʼelu etuto ahụ, ahụ ga-adịkwa ya mma.”

22Hezekaya jụrụ sị, “Gịnị ga-abụ ihe ịrịbama na m ga-aga nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị?”

← Aịzaya 37 Aịzaya Aịzaya 39 →