We Believe JesusFé, Esperança e Nova Vida

Nehemaya 1

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · ib

Nehemaya Nehemaya 2 →

1Nke a bụ okwu Nehemaya nwa Hakalaya:

2otu nwanne m nwoke aha ya bụ Hanani,1:2 Ọ ga-abụ onye nne ji ya na Nehemaya, onye bịara zie ya ozi banyere ọnọdụ Jerusalem. Neh 7:2 na ụfọdụ ndị ọzọ sitere Juda bịara ileta m. Ajụrụ m ha ajụjụ otu ihe si agara ndị Juu ahụ fọdụrụ, ndị si ebe dị iche iche lọta, jụọkwa ha maka Jerusalem.

3Ha zara si: “Ndị ahụ niile lọtara1:3 E kewara alaeze Peshịa mpaghara atọ. Nʼobodo Sameria ka ndị na-achị mpaghara Juda nọ. nọ nʼoke nsogbu na ihere. A kụdara mgbidi Jerusalem; e sukwara ọnụ ụzọ ama ya niile ọkụ.”

4Mgbe m nụrụ okwu ndị a, anọdụrụ m ala kwaa nnọọ akwa. Nʼezie, ajụrụ m iri ihe ọbụla ọtụtụ ụbọchị, nʼihi na eji m oge m niile kpee ekpere rịọ Chineke nke eluigwe arịrịọ,

5si ya:

6Leda anya ebere gị ka ị nụrụ arịrịọ mụ bụ ohu gị na-arịọ gị ehihie na nʼabalị. Ana m ekwupụta mmehie anyị bụ ụmụ Izrel, ma nke m na ezinaụlọ nna m mere megide gị.

7Anyị emela ihe jọrọ njọ megide gị. Anyị edebeghị iwu gị na ụkpụrụ gị nke i nyere ohu gị Mosis.

8“Chetakwa ntụziaka inyere Mosis bụ ohu gị, na-asị, ‘Ọ bụrụ na unu emehie, mụ onwe m ga-achụsa unu nʼetiti mba dị iche iche.

9Ma ọ bụrụ na unu alaghachikwute m, debe ihe niile m nyere unu nʼiwu, a sikwa na a chụsara unu mee ka unu gbasaa ga nʼakụkụ niile nke ụwa, aga m achịkọta unu mee ka unu laghachi na Jerusalem bụ obodo m họpụtara nye Aha m.’

10“Anyị bụ ndị ohu gị, bụrụkwa ndị i ji aka gị dị ike zọpụta.

11Biko, Onyenwe anyị, nụrụ ekpere mụ bụ ohu gị, nụrụkwa ekpere ndị ohu gị niile ọ na-atọ ụtọ ịtụ egwu aha gị. Mee ka ihe gara ohu gị nke ọma taa site nʼimere ya ebere nʼihu nwoke a.1:11 Eze a na-ekwu maka ya nʼebe bụ Ataksekses, Ezr 4:21”

Nehemaya Nehemaya 2 →