1Ndị a bụ akụkọ banyere Shem, Ham na Jafet, ụmụ ndị ikom atọ Noa mụrụ. Ha onwe ha mụtara ụmụ nke aka ha, mgbe uju mmiri gafesịrị.
2Ụmụ ndị ikom Jafet bụ:
3Ụmụ ndị ikom Goma bụ:
4Ụmụ ndị ikom Javan bụ:
5(Site nʼagbụrụ ndị a bi nʼakụkụ mmiri ka e nwetara mba dị iche iche, nʼagbụrụ ha nʼime obodo ha dị iche iche, ndị ọbụla nʼime ha nwekwara asụsụ nke ha.)
6Ụmụ ndị ikom Ham bụ:
7Ụmụ ndị ikom Kush10:7 Ọ bụ nʼime ala Arab ka mba asaa ndị Kush dị. bụ:
8Kush bụ nna Nimrọd, onye mesịrị bụrụ dike nʼagha nʼụwa.
9Ọ bụ dike nʼịchụ nta, nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụ nke a mere e ji na-ekwu okwu na-asị, “Ị dị ka Nimrọd, dike nʼịchụ nta, nʼihu Onyenwe anyị.”
10Obodo ndị bụ mmalite alaeze ya bụ, Babel,10:10 Maọbụ, Babilọn Erek, Akad na Kalne, ndị dị nʼala Shaịna.10:10 Shaịna bụ ala Babilọn ochie.
11Site nʼala ahụ ọ gara Asịrịa, ebe o wuru obodo Ninive na Rehobọt Ia, na Kala,
12na Resin, nke dị nʼetiti Ninive na Kala, ya bụ obodo ukwu ahụ.
13Ijipt bụ nna ndị
14ndị Patrus, ndị Kasluh (onye ndị Filistia10:14 Ndị Filistia bụ mba si nʼagbụrụ (agwara ụgwa) abụọ, otu agbụrụ sitere nʼEshịa, ebe nke ọzọ bụ agbụrụ ndị Ọcha. Njem mbụ ha duuru ha gaa ala Kriit, ebe ha gara biri. Jer 47:4; Ems 9:7 Emesịa, ha busoro ndị Ijipt agha na senchuri nke iri na atọ, ma bichie ala ha. Mgbe e sitere nʼala Ijipt chụpụ ha, ha gara biri nʼakụkụ ọnụ mmiri ala Kenan. sitere na ya) na ndị Kafto.
15Kenan bụ nna
16ndị Jebus, ndị Amọrait, ndị Gigash,
17ndị Hiv, ndị Aka, ndị Sini,
18ndị Avad, ndị Zema na ndị Hamat.
19oke ala ndị Kenan sitere na Saịdọn ruo Gera, gbatịa ruo Gaza, ruokwa Sọdọm, Gọmọra, Adma na Zeboiim, nke dị nso Lasha.
20Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Ham, dịka ikwu ha na asụsụ ha si dị, nʼoke ala ebe ha bi, na obodo ha dị iche iche.
21A mụụrụ Shem ụmụ ndị ikom, onye nwanne nwoke nke tọrọ ya bụ Jafet. Ọ bụkwa nna nna ochie ụmụ ndị ikom niile Eba mụtara.
22Ụmụ ndị ikom Shem bụ
23Ụmụ ndị ikom Aram bụ,
24Apakshad bụ nna Shela,
25Eba mụtara ụmụ ndị ikom abụọ:
26Joktan bụ nna
27Hadoram, Ụzal, Dikla,
28Obal, Abimael, Sheba,
29Ọfịa, Havila na Jobab. Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Joktan.
30Akụkụ ala ha bi gbasapụrụ site na Mesha ruo Sefa nʼala ugwu ugwu nke ọwụwa anyanwụ.
31Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Shem, dịka ikwu ha na asụsụ ha si dị, nʼoke ala ebe ha dị, na obodo ha dị iche iche.
32Ndị a bụ ndị ikwu ụmụ Noa ndị ikom dịka usoro ọmụmụ ha si dị, dịka ha si biri na mba dị iche iche. Ọ bụ site na ndị a ka mba niile si gbasasịa ruo akụkụ niile nke ụwa mgbe uju mmiri ahụ gafechara.