1Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
2“Ma gị onwe gị, Nwa nke mmadụ, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị ala Izrel:
3Ugbu a ka ọgwụgwụ bịakwasịrị unu.
4Agaghị m enwekwa ọmịiko nʼebe ị nọ,
5“Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị,
6Ọgwụgwụ abịala!
7Oke nsogbu abịakwasịla gị,
8Ejikerela m ịwụkwasị gị ọnụma m nʼahụ
9Agaghị m emere gị ebere,
10“ ‘Lee, ụbọchị ahụ!
11Ihe ike ebilitala,
12Mgbe ahụ abịala!
13Onye rere ahịa agaghị enwetaghachi
14“ ‘Ha afụọla opi ike,
15Mma agha dị nʼezi;
16Ma ndị gbapụrụ agbapụ
17Aka niile ga-akụda,
18Ha ga-eyikwasị akwa mkpe,
19“ ‘Ha ga-etufu ọlaọcha ha niile nʼokporoụzọ niile,
20Ihe ịchọ mma ha ghọọrọ ha ihe ịkpa nganga,
21Aga m ewere akụnụba ha nye ndị mba ọzọ dịka ihe apụnatara nʼagha,
22Aga m esite nʼebe ha nọ wezuga ihu m
23“ ‘Kwadoonụ ụdọ igwe.
24Aga m akpọta mba ndị ahụ jọgburu onwe ha
25Mgbe ihe mmekpa ahụ bịara,
26Mbibi ga-esochi mbibi,
27Eze ga-eru ụjụ,