We Believe JesusFé, Esperança e Nova Vida

Izikiel 30

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · ib

← Izikiel 29 Izikiel Izikiel 31 →

1Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

2“Nwa nke mmadụ, buo amụma sịkwa, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu,

3Nʼihi nʼụbọchị ahụ adịla nso,

4Mma agha ga-abịakwasị Ijipt,

5Kush30:5 Ya bụ, Itiopia na Libiya, Lidiya na ndị Arebịa niile gwara ọgwa, Kub na ndị mba ọgbụgba ndụ ahụ, na Ijipt ga-eso daa site na mma agha.

6“ ‘Ọ bụ ihe a ka Onyenwe anyị kwuru:

7Ha ga-atọgbọrọ nʼefu,

8Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị,

9“ ‘Nʼụbọchị ahụ, aga m ezipu ndị ozi ndị ga-eji ụgbọ dị iche iche, ka ha gaa menye ndị Kush egwu, bụ ndị onwe ha jụrụ afọ. Oke egwu ga-ejidekwa ha nʼoge ahụ nʼihi ihe dakwasịrị Ijipt, nʼihi ihe ndị a aghaghị imezu.

10“ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,

11Ya onwe ya na ndị agha ya, bụ mba kachasị mba niile njọ na-enweghị obi ebere,

12Aga m eme ka osimiri Naịl taa. Ọ ga-aghọkwa ala kpọrọ nkụ.

13“ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,

14Aga m emekwa ka Patros tọgbọrọ nʼefu.

15M ga-awụkwasị Pelusium30:15 Maọbụ, Sin ọnụma m,

16Aga m amụnye ọkụ nʼIjipt,

17Ụmụ okorobịa Heliopolis na Bubasti

18Ụbọchị ahụ ga-agba ọchịchịrị na Tapanhis

19Aga m eme ka Ijipt taa ahụhụ dị ukwuu,

20O ruo, nʼafọ nke iri na otu ya, nʼụbọchị nke asaa, nʼọnwa nke mbụ, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

21“Nwa nke mmadụ, agbajiela m ogwe aka Fero, eze Ijipt. Lee, o nwebeghị onye gbara ya ọkpụkpụ, ma ọ bụkwanụ kee ya ihe, ka o sie ike ọzọ ijide mma agha.

22Nʼihi ya, nke a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị: Lee, mụ onwe m na-emegide Fero bụ eze Ijipt. Aga m agbaji ogwe aka ya abụọ, ma nke siri ike ma nke gbajiri agbaji na mbụ. Aga m emekwa ka mma agha ya si nʼaka ya dapụ.

23Aga m achụsa ndị Ijipt nʼetiti mba niile tụsaakwa ha nʼobodo niile,

24meekwa ka ogwe aka abụọ nke eze Babilọn sie ike. Aga m etinye mma agha m nʼaka ya, ma ogwe aka abụọ nke Fero ka m ga-agbajisi. Mgbe ahụ, Fero ga-asụ ude nʼihu eze Babilọn dịka onye e merụrụ ahụ.

25Aga m eme ka ogwe aka abụọ nke eze Babilọn sie ike; ma ogwe aka Fero ga-akpọnwụ. Mgbe ahụ, ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m tinyere mma agha nʼaka eze Babilọn, na mgbe o setịpụrụ ya imegide Ijipt.

26Aga m achụsa ndị Ijipt nʼetiti mba niile, fesaa ha nʼala niile. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”

← Izikiel 29 Izikiel Izikiel 31 →