We Believe JesusFé, Esperança e Nova Vida

Ọpụpụ 15

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · ib

← Ọpụpụ 14 Ọpụpụ Ọpụpụ 16 →

1Mgbe ahụ, Mosis na ụmụ Izrel bụkuru Onyenwe anyị abụ dị otu a sị,

2“Onyenwe anyị bụ ike m na abụ m.

3Onye na-ebu agha ka Onyenwe anyị bụ.

4Ụgbọ agha Fero na usuu ndị agha ya,

5Ogbu osimiri ahụ ekpuchiela ha.

6Aka nri gị Onyenwe anyị, dị ike,

7“Nʼoke ike nke ịdị elu gị,

8I sitere na nkuume nke oghere imi gị,

9Onye iro nyara isi sị,

10Ma i kupụrụ ikuku si gị nʼimi pụta,

11Onye dịka gị Onyenwe anyị,

12“I setịpụrụ aka nri gị,

13Site nʼebere gị,

14Ụwa niile nụrụ ya, maa jijiji.

15Ndị eze Edọm ga-anọ nʼọnọdụ obi ịlọ mmiri.

16oke egwu na oke ụjọ ejidela ha.

17Gị onwe gị ga-akpọbata ha, kụọ ha dịka mkpụrụ,

18“Onyenwe anyị ga-abụ eze

19Mgbe ịnyịnya Fero, na ụgbọ agha ya, na ndị na-agba ịnyịnya, gbabanyere nʼosimiri, Onyenwe anyị mere ka mgbidi mmiri ahụ dagbuo ha. Ma ụmụ Izrel sitere nʼala mmiri kọrọ gafee.

20Nʼoge ahụ, Miriam onye amụma nwanyị, nwanne Erọn weere ịgba iti egwu nʼaka ya, duo ndị inyom ndị so ya, jiri ịgba egwu nke ha na-etekwa egwu.

21Miriam bụrụ abụ sị ha,

22Mgbe ihe ndị a mesịrị, Mosis nọgidere na-edu ụmụ Izrel. Ha sitere nʼOsimiri Uhie ahụ bilie ije, jeruo ọzara Shua. Ha jere ije nʼime ọzara abalị atọ, ma ha achọtaghị mmiri ọṅụṅụ

23Mgbe ha ruru Mara, ha enweghị ike ịṅụ mmiri dị nʼebe ahụ, nʼihi na mmiri ahụ na-elu ilu. (Ọ bụ ilu ilu a mere e ji kpọọ ya Mara.)

24Nʼebe a, ụmụ Izrel malitere itamu ntamu, megide Mosis sị, “Olee mmiri anyị ga-aṅụ?”

25Mosis tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa. Onyenwe anyị gosiri Mosis osisi ọ ga-atụnye nʼime mmiri ahụ. Mgbe Mosis mere otu a, mmiri ahụ malitere ịdị ụtọ ọṅụṅụ.

26Ọ sịrị, “Ọ bụrụ na unu ga-ege ntị nke ọma nʼokwu Onyenwe anyị Chineke unu, mee ihe ziri ezi nʼanya ya, ọ bụrụkwa na unu eleruo anya idebe iwu ya na ụkpụrụ ya niile, ọ dịghị ọrịa nke m tinyere nʼahụ ndị Ijipt nke m ga-etinye nʼahụ unu. Nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, onye na-agwọ unu ọrịa niile.”

27Ha bịaruru nʼobodo Elim, ebe e nwere isi iyi mmiri ala na-asọpụta dị iri na abụọ, na iri osisi nkwụ asaa. Ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ mmiri ahụ.

← Ọpụpụ 14 Ọpụpụ Ọpụpụ 16 →