1Ya mere, cheta Onye kere gị
2Tupu anyanwụ na ìhè,
3Mgbe ndị na-echebe ụlọ ga-ama jijiji,
4mgbe e mechiri ọnụ ụzọ nke pụrụ nʼokporoụzọ,
5mgbe ndị mmadụ ga-atụ egwu ebe dị elu;
6E, cheta ya, tupu e gbubie ụdọ ọlaọcha ahụ,
7Mgbe ahụ, anụ ahụ anyị ga-alaghachi nʼaja ebe o si pụta;12:7 Jen 3:19; Job 34:15; Abụ 90:3
8“Ihe efu! Ihe efu!” ka onye ozizi kwuru.
9Ọ bụghị naanị nʼonye ozizi ahụ bụ onye maara ihe, o jegharịrị na-ezi ndị mmadụ ihe ọ maara. Ọ tụgharịrị uche chọpụta ọtụtụ ilu, detuokwa ha nʼusoro.
10Onye ozizi chọpụtara okwu ndị dabanyere nʼusoro, ihe o depụtara bụ ihe ziri ezi na eziokwu.
11Okwu ọnụ nke onye maara ihe dị ka ndụdụ e ji achụ ehi. Nchịkọta okwu amamihe ndị a dị ka ǹtu a kumiri nke ọma, nke onye na-azụ atụrụ nyere.
12Ma nwa m nwoke lezie anya, atụkwasịla ihe ọzọ nʼelu ihe ndị a.
13Ugbu a anụla ihe ndị a niile,
14Nʼihi na Chineke ga-ekpe ọrụ ọbụla ikpe,