1Okwu onye ozizi, nwa Devid, onye bụ eze na Jerusalem.
2Ihe efu, ihe niile bụ ihe efu
3Olee uru mmadụ na-enweta site na ndọgbu niile
4Otu ọgbọ laa, ọgbọ ọzọ abịa,
5Anyanwụ na-awa, na-adakwa,
6Ifufe na-efe gaa na ndịda;
7Mmiri dị nʼiyi niile na-asọbanye nʼoke osimiri
8Ihe niile nọ na-adọgbu onwe ha nʼọrụ;
9Ihe ọbụla nke dịrịla na mbụ ga-adịkwa ọzọ.
10Ọ dị ihe enwere ike ikwu sị,
11Anaghị echeta ndị mgbe ochie,
12Mụ onwe m bụ onye nkuzi, bụrịị eze Izrel nʼime Jerusalem.
13Ekpebiri m, were onwe m nye, iji amamihe nnyochapụta ihe m nwere ike ịmata banyere ihe niile a na-eme nʼime ụwa. Olee ụdị ibu arọ bụ nke a, nke Chineke bokwasịrị ụmụ mmadụ?
14Enyochaala m ihe niile a na-eme nʼụwa chọpụta na ha enweghị isi. Ọ dị ka mmadụ ịchụgharị ifufe.
15Ihe gbagọrọ agbagọ, apụghị ime ya ka ọ dizie.
16Echere m nʼime obi m sị, “Lee anya! Aghọọla m onye ukwu, bụrụ onye maara ihe karịa ndị eze niile chịrịla na Jerusalem. Enweela m amamihe nʼebe ọ dị ukwu, babigakwa ụba oke nʼihe ọmụma.”
17Nʼihi ya, agbalịsiri m ike ịmụta ihe dị iche nʼetiti ihe ọmụma, na ịyị ara na nzuzu. Ma ihe m chọpụtara bụ na ọ baghị uru. Ọ dị ka itufu oge ịchọ ụzọ ijide ifufe.
18Nʼihi na mgbe amamihe na-aba ụba, mgbe ahụ ka iwe na ọnụma na-ejupụta,