We Believe JesusFé, Esperança e Nova Vida

Ekiliziastis 1

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · ib

Ekiliziastis Ekiliziastis 2 →

1Okwu onye ozizi, nwa Devid, onye bụ eze na Jerusalem.

2Ihe efu, ihe niile bụ ihe efu

3Olee uru mmadụ na-enweta site na ndọgbu niile

4Otu ọgbọ laa, ọgbọ ọzọ abịa,

5Anyanwụ na-awa, na-adakwa,

6Ifufe na-efe gaa na ndịda;

7Mmiri dị nʼiyi niile na-asọbanye nʼoke osimiri

8Ihe niile nọ na-adọgbu onwe ha nʼọrụ;

9Ihe ọbụla nke dịrịla na mbụ ga-adịkwa ọzọ.

10Ọ dị ihe enwere ike ikwu sị,

11Anaghị echeta ndị mgbe ochie,

12Mụ onwe m bụ onye nkuzi, bụrịị eze Izrel nʼime Jerusalem.

13Ekpebiri m, were onwe m nye, iji amamihe nnyochapụta ihe m nwere ike ịmata banyere ihe niile a na-eme nʼime ụwa. Olee ụdị ibu arọ bụ nke a, nke Chineke bokwasịrị ụmụ mmadụ?

14Enyochaala m ihe niile a na-eme nʼụwa chọpụta na ha enweghị isi. Ọ dị ka mmadụ ịchụgharị ifufe.

15Ihe gbagọrọ agbagọ, apụghị ime ya ka ọ dizie.

16Echere m nʼime obi m sị, “Lee anya! Aghọọla m onye ukwu, bụrụ onye maara ihe karịa ndị eze niile chịrịla na Jerusalem. Enweela m amamihe nʼebe ọ dị ukwu, babigakwa ụba oke nʼihe ọmụma.”

17Nʼihi ya, agbalịsiri m ike ịmụta ihe dị iche nʼetiti ihe ọmụma, na ịyị ara na nzuzu. Ma ihe m chọpụtara bụ na ọ baghị uru. Ọ dị ka itufu oge ịchọ ụzọ ijide ifufe.

18Nʼihi na mgbe amamihe na-aba ụba, mgbe ahụ ka iwe na ọnụma na-ejupụta,

Ekiliziastis Ekiliziastis 2 →