We Believe JesusFé, Esperança e Nova Vida

Mkpughe 15

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · ib

← Mkpughe 14 Mkpughe Mkpughe 16 →

1Ahụkwara m ihe ịrịbama ọzọ nʼeluigwe. Ọ dị ebube dịkwa oke egwu. Ndị mmụọ ozi asaa ji ụzọ ahụhụ asaa. Ha bụ ahụhụ nke ikpeazụ ndị ga-eweta iwe Chineke na ngwụcha.

2Ahụrụ m ihe dịka oke osimiri enyo a gwakọtara ya na ọkụ, na ndị ahụ nweterala mmeri nʼebe anụ ọhịa ahụ na oyiyi ya, na ọnụọgụgụ aha ya. Ha guzo nʼakụkụ oke osimiri enyo ahụ, jidekwa ụbọ akwara nke Chineke nʼaka ha.

3Ha na-abụ abụ Mosis ohu Chineke, na abụ Nwa atụrụ ahụ.

4Onye ga-aghara ịtụ gị egwu, Onyenwe anyị,

5Mgbe nke a gasịrị, elere m anya hụ, na e meghere, ụlọnsọ ukwu dị nʼeluigwe, ya bụ, ụlọ ikwu nke iwu ọgbụgba ndụ ahụ.

6Mmụọ ozi asaa ndị ahụ ji ihe ntaramahụhụ asaa sị nʼụlọnsọ ahụ pụta. Ha yi uwe ogho ọcha, akwa ọcha na-enwu ezigbo ọcha. E kekwasịrị ihe okike ọlaedo gburugburu obi ha.

7Otu nʼime anụ anọ ndị ahụ dị ndụ bunyere mmụọ ozi asaa ndị ahụ efere ọlaedo asaa a gbajuru ọnụma Chineke, bụ onye ahụ na-adị ndụ mgbe niile ebighị ebi.

8Mgbe ahụ ụlọnsọ ahụ jupụtara nʼanwụrụ ọkụ si nʼebube na ike Chineke na-apụta. O nweghị onye ọbụla nwere ike ịba nʼụlọnsọ ahụ tutu ruo mgbe ntaramahụhụ asaa nke ndị mmụọ ozi asaa ahụ gwụchara.

← Mkpughe 14 Mkpughe Mkpughe 16 →