1Devid buuru Onyenwe anyị okwu niile nke abụ a mgbe Onyenwe anyị napụtara ya site nʼaka ndị iro ya niile, nakwa nʼaka Sọl.
2Ọ sịrị:
3Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya.
4“Akpọkuru m Onyenwe anyị; onye e kwesiri inye otuto.
5Ebili mmiri nke ọnwụ gbara m gburugburu;
6Ụdọ niile nke ili kere m agbụ,
7“Nʼọnọdụ oke mkpagbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị,
8Ụwa mere mkpọtụ maa jijiji,
9Anwụrụ ọkụ sitere ya nʼimi pụta;
10O kewara mbara eluigwe, rịdata;
11Ọ nọkwasịrị nʼelu cherubim felie elu,
12O mere ọchịchịrị ihe mkpuchi nke gbara ya gburugburu,
13Site nʼìhè nke na-enwupụta nʼahụ ya,
14Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe bigbọọ.
15Ọ gbara àkụ ya, mee ka ndị iro gbasasịa.
16E kpughere ala ala nke oke osimiri.
17“O sitere nʼelu setịpụ aka ya,
18Ọ napụtara m site nʼaka ndị iro m dị ike,
19Ha guzogidere m nʼụbọchị ihe ndakwasị m.
20Ọ kpọpụtara m gaa nʼebe sara mbara,
21“Onyenwe anyị mesoro m dịka ezi omume m si dị,
22Nʼihi na edebezuola m ụzọ niile nke Onyenwe anyị;
23Iwu ya niile dị nʼihu m,
24Abụ m onye na-enweghị ịta ụta nʼihu ya,
25Onyenwe anyị kwụghachiri m dịka ezi omume m si dị,
26“Nʼebe onye kwesiri ntụkwasị obi nọ, i na-egosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi,
27Nʼebe onye dị ọcha nọ, ị na-egosi onwe gị onye dị ọcha,
28Ị na-azọpụta ndị dị umeala nʼobi,
29Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, bụ oriọna m,
30Site nʼinyeaka gị, apụrụ m ịlụso igwe ndị agha ọgụ;
31“Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke;
32Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị?
33Ọ bụ Chineke na-enye m ike,
34Ọ na-eme ka ụkwụ m dị gara gara, dịka nke nne ele
35Ọ na-azụ aka m abụọ ibu agha,
36Ị na-eme ka inyeaka nke nzọpụta gị bụrụ ọta m,
37Ị na-edozi ụzọ sara mbara nye ụkwụ.
38“Achụrụ m ndị iro m ọsọ, kpochapụ ha.
39Etidara m ha nʼala kpamkpam. Ha enwekwaghị ike ibilite.
40Ọ bụ gị nyere m ike ibu agha.
41I meela ka ndị iro m tụgharịa gbalaga.
42Ha bere akwa maka enyemaka, ma ọ dịghị onye na-azọpụta ha.
43Egwepịara m ha nke ọma, mee ka ha dịrị ka ntụ nke ala.
44“Ị napụtala m site nʼaka ndị niile na-alụso m ọgụ.
45Ndị ala ọzọ na-ehulata nʼihu m nʼihi egwu,
46Obi na-ada ha mba.
47“Onyenwe anyị na-adị ndụ. Otuto dịrị oke nkume m.
48Ọ bụ Chineke ahụ, onye na-abọrọ m ọbọ.
49Onye na-anapụta m site nʼaka ndị iro m.
50Nʼihi nke a, Onyenwe anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile dị iche iche.
51“Chineke na-enye eze ya mmeri dị ukwuu.