We Believe JesusFé, Esperança e Nova Vida

2 Samuel 1

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · ib

2 Samuel 2 Samuel 2 →

1Mgbe Sọl nwụsịrị, Devid si ebe ọ gara tigbuo ndị Amalek lọghachi. Devid nọrọ ụbọchị abụọ na Ziklag.

2O ruo, nʼụbọchị nke atọ, otu nwoke si nʼọmụma ụlọ ikwu Sọl bịakwutere ya. Uwe nwoke a yi nʼahụ dọwara adọwa. Isi ya dịkwa aja aja. Ọ batara daa nʼala nʼihu Devid nʼọnọdụ inye ya nsọpụrụ.

3Devid jụrụ ya sị, “Ebee ka i si bịa?”

4Devid jụrụ ya sị, “Gịnị mere? Biko gwa m.”

5Devid jụrụ ya sị, “Olee otu i si mata na Sọl na Jonatan anwụọla?”

6Nwokorobịa ahụ sịrị ya, “Ọ dapụtara na m nọ nʼugwu Gilboa hụ Sọl mgbe ọ dabeere nʼùbe ya. Mgbe ahụ ụgbọ agha ndị iro na ndị na-agba ịnyịnya agha na-esosi ya ike.

7Mgbe ọ hụrụ m, ọ kpọrọ m ka m bịakwute ya. Azara m ya sị, ‘Gịnị ka m nwere ike ime?’

8“Ọ jụrụ m sị, ‘Ị bụ onye?’

9“Ọ sị m, ‘Biko, bịa guzo nʼakụkụ m ka ị gbuo m, nʼihi na ọ bụ ezie na m dị ndụ, ma anọ m nnọọ nʼoke ihe mgbu nke ọnwụ.’

10“Ya mere, eguzoro m nʼakụkụ ya, gbuo ya, nʼihi na amaara m na ọ gaghị adị ndụ tee anya. Ọ bụkwa mgbe m gbusịrị ya ka m kpupụrụ ya okpueze dị ya nʼisi, gbapụtakwa ya mgbaaka dị nʼogwe aka ya, chịrị ha, ka m chịtara gị ha, onyenwe m.”

11Mgbe Devid na ndị ikom ya nụrụ ihe ndị a. Ha dọwara uwe ha.

12Ha ruru ụjụ. Kwaa akwa. Bukwaa ọnụ ruo oge anyasị nʼihi Sọl na Jonatan nwa ya nwoke, na nʼihi ndị agha Onyenwe anyị na ụlọ Izrel. Nʼihi na ha dara site na mma agha.

13Mgbe ahụ, Devid jụrụ nwokorobịa ahụ wetara ozi ahụ ajụjụ sị, “Olee ebe i si bịa?”

14Devid jụrụ ya sị, “Gịnị mere i ji setịpụ aka gị, na-atụghị ụjọ, tigbuo onye Onyenwe anyị tere mmanụ?”

15Devid kpọrọ otu nʼime ndị ikom ya sị ya, “Gbuo ya!” Nwoke ahụ weere mma agha gbuo ya.

16Mgbe ahụ Devid sịrị ya, “Ọbara gị laa gị nʼisi, nʼihi na ị ji ọnụ gị kwupụta sị, ‘Egburu m onye Onyenwe anyị tere mmanụ.’ ”

17Emesịa, Devid depụtara abụ akwa a nʼihi Sọl na Jonatan.

18O nyere iwu ka akụziere ndị Juda, abụ ùta a. E dere ya nʼime akwụkwọ Jesha.

19“Ebube gị, gị Izrel, abụrụla ihe e gburu nʼebe gị niile dị elu.

20“Ekwutela ya na Gat.1:20 Obodo Gat na Ashkelọn dị nʼala Filistia. 1Sa 6:17; 1Sa 27:2

21“Unu ugwu Gilboa,

22“Site nʼọbara ndị e gburu egbu,

23Sọl na Jonatan,

24“Ụmụada1:24 Maọbụ, Ụmụ ndị inyom Izrel. Izrel,

25“Lee ka ndị dị ike si daa nʼetiti ọgbọ agha.

26ana m eruru gị ụjụ, gị Jonatan, nwanne m

27“Lee ka ndị dị ike si daa!

2 Samuel 2 Samuel 2 →