We Believe JesusFé, Esperança e Nova Vida

1 Ihe E Mere 26

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · ib

← 1 Ihe E Mere 25 1 Ihe E Mere 1 Ihe E Mere 27 →

1Usoro otu ndị nche ọnụ ụzọ ụlọnsọ ahụ.

2Meshelemaia nwekwara ụmụ ndị ikom:

3Elam, nke ise na Jehohanan, bụ nke isii

4Obed-Edọm nwekwara ụmụ ndị ikom. Ha bụ ndị a:

5Amiel, nke isii

6Shemaya, nwa ya mụtakwara ụmụ ndị ikom, ndị bụ ndị ndu nʼezinaụlọ nna ha, nʼihi na ha bụ dike na dimkpa.

7Ụmụ ndị ikom Shemaya bụ,

8Ndị a niile bụ ụmụ ụmụ Obed-Edọm; ha na ụmụ ha ndị ikom, na ndị ikwu ha niile bụ dimkpa ndị nwere ike ịrụ ọrụ ahụ. Ha niile bụ ụmụ ụmụ Obed-Edọm. Ha dị iri isii na abụọ (62) nʼọnụọgụgụ.

9E sitekwara nʼezinaụlọ Meshelemaia họpụta ndịisi iri na asatọ (18) ndị bụkwa ezi ndị ndu.

10Hosa, nwa Merari nwekwara ụmụ ndị ikom:

11Hilkaya, nke abụọ, Tebalaya, nke atọ

12E kere ndị nche ụlọnsọ ukwu niile nʼotu nʼotu. Otu ndị a nwekwara ndịisi. E kenyekwara otu ọbụla ọrụ dịka e si kenye ụmụnna ha ọrụ ha nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.

13E sitere nʼife nza kenye ma nwantakịrị ma okenye, ọnụ ụzọ ha ga-eche nche, dịka ezinaụlọ ha si dị.

14Site nʼife nza, Shelemaya ketara iche ọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nche.

15Obed-Edọm na ndị otu ya na-eche ụzọ dị na ndịda. Ụmụ ya bụ ndị na-eche ụlọ ebe a na-achịkọta ihe.

16Shupim na Hosa na-eche ọnụ ụzọ dị nʼọdịda anyanwụ ya na ọnụ ụzọ ama Shaleket nke dị nʼụzọ elu elu.

17Ya mere, ọ bụ ndị Livayị isii na-eche nche nʼọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ụbọchị niile.

18Nʼogige nke dị nʼọdịda anyanwụ e nwere ndị nche anọ nʼụzọ, ndị nche abụọ ọzọ nʼime ogige nʼonwe ya.

19A họpụtara ndị nche ndị a site nʼikwu Kora na Merari.

20Ụfọdụ ndị Livayị ka e nyefere ọrụ ilekọta ụlọakụ, na ụlọ a na-echekọta onyinye niile e doro nsọ nke e webatara nʼụlọnsọ ukwu Chineke.

21Ndị agbụrụ Ladan, ndị si nʼikwu Geshọn, ndị bụ ndịisi ezinaụlọ nna ha Ladan, bụ onye Geshọn, bụ Jehieli,

22na ụmụ ndị ikom Jehieli, Zetam na nwanne ya nwoke Juel. Ndị a bụ ndị na-elekọta ụlọakụ niile dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.

23Site na ndị Amram, na ndị Izha, na ndị Hebrọn, na ndị Uziel.

24Shubuel nwa Geshọm, na nwa nwa Mosis ka e nyere ọrụ ịbụ onyeisi ụlọakụ dị nʼụlọnsọ ahụ.

25Ụmụnna ya site na Elieza bụ ndị a, Rehabaya nwa ya nwoke, Jeshaya nwa nwoke Rehabaya, Joram nwa nwoke Jeshaya na Zikri nwa nwoke Shelomit.

26Shelomit na ụmụnna ya ka ọ dị nʼaka ilekọta ụlọakụ nke ihe nsọ niile, nke Devid bụ eze, na ndịisi ezinaụlọ niile, ndị bụ ndịisi agha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, na ndịisi agha na-achị ọtụtụ narị ndị agha, na ndịisi agha ndị ọzọ, doro nsọ.

27Ụfọdụ ihe agha na ihe sitere nʼihe a kwatara nʼagha ka ha doro nsọ maka idozi ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.

28Ya na ihe niile nke Samuel, bụ onye ọhụ ụzọ, na Sọl, nwa Kish na Abna, nwa Nea na Joab, nwa Zeruaya na ihe niile ndị ọzọ e doro nsọ. Ọ bụ nʼaka Shelomit na ụmụnna ya ka ọ dị ilekọta ha.

29Site nʼikwu Izha,

30Site na ndị Hebrọn,

31Jeraya bụ onyendu ndị Hebrọn, dịka akwụkwọ e dekọrọ usoro ọmụmụ si gosi.

32Jeraya nwere ndị ikwu ya, ndị bụ dimkpa, na ndị dị ike ọrụ, ọnụọgụgụ ha dị puku abụọ na narị asaa. Ndị a niile bụkwa ndị ndu ezinaụlọ dị iche iche. Ya mere, Devid, eze Izrel, mere ha ndịisi ebo Ruben, na ebo Gad, na ọkara ebo Manase. Ọrụ ha bụ ilekọta ihe banyere ofufe Chineke na ije ozi niile metụtara eze.

← 1 Ihe E Mere 25 1 Ihe E Mere 1 Ihe E Mere 27 →