1Ha bubatara igbe ọgbụgba ndụ Chineke ahụ guzobe ya nʼime ụlọ ikwu nke Devid manyere maka ya. Ha chekwara aja nsure ọkụ na aja udo nʼihu Chineke.
2Mgbe Devid chụsịrị aja nsure ọkụ na aja udo ndị a, ọ gọziri ndị Izrel nʼaha Onyenwe anyị.
3O nyekwara onye ọbụla nʼIzrel, ma nwoke ma nwanyị, otu ogbe achịcha, ọkpụrụkpụ anụ na achịcha mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ.
4Ọ họpụtara ụfọdụ ndị Livayị ka ha nọdụ nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ inye Onyenwe anyị, Chineke Izrel ekele na otuto na ịrịọ ya ngọzị nʼisi ndị ya Izrel. Ndị a bụ ndị o nyere ije ozi a:
5Asaf bụ onyeisi ndị a. Ndị ọzọ bụ Zekaraya, Jeiel, Shemiramot, Jehiel, Matitaia, Eliab, Benaya, Obed-Edọm na Jeiel. Ọrụ ha bụ ịkpọ ụbọ akwara, na une, ma ọrụ Asaf bụ onye na-akụ ogene ọla na-ada ụda.
6Benaya na Jahaziel, ndị nchụaja, ketara ọrụ ịfụ opi nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Chineke kwamgbe kwamgbe.
7Nʼụbọchị ahụ ka Devid buru ụzọ họpụta Asaf na ndị otu ya ka ha nye Onyenwe anyị otuto nʼusoro dị otu a:
8Nyenụ Onyenwe anyị otuto, kwupụtakwa aha ya,
9Bụkuonụ ya abụ, bụkuonụ ya abụ otuto;
10Ṅụrianụ nʼime aha nsọ ya;
11Na-achọnụ Onyenwe anyị na ike ya,
12Chetanụ ọrụ ebube niile nke ọ rụrụ,
13Unu, ụmụ Izrel, bụ ohu ya
14Ya onwe ya bụ Onyenwe anyị Chineke anyị;
15Ọ na-echeta ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi;
16Ọgbụgba ndụ ahụ nke ya na Ebraham gbara,
17O mere ka o guzoro nye Jekọb dịka ụkpụrụ,
18Sị, “Aga m enye gị ala Kenan
19Mgbe ha dị ole na ole nʼọnụọgụgụ,
20Ha wagharịrị site nʼotu mba gaa mba ọzọ,
21O kweghị ka onye ọbụla mekpaa ha ahụ;
22“Unu emetụkwala ndị m e tere mmanụ aka,
23Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ụwa niile;
24Kwusaanụ ebube ya nʼetiti mba niile,
25Nʼihi na Onyenwe anyị dị ukwuu, ọ bụkwa onye kachasị ka e nye otuto.
26Nʼihi na chi niile nke mba niile dị iche iche bụ arụsị efu,
27Ịma mma na ebube dị nʼihu ya;
28Nyenụ Onyenwe anyị, unu ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche,
29E, nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ ruuru aha ya,
30Maa jijiji nʼihu ya, unu ụwa niile.
31Ka eluigwe ṅụrịa, ka ụwa nwekwa obi ụtọ;
32Ka osimiri bigbọọ, na ihe niile dị nʼime ya,
33Ka osisi niile nke oke ọhịa bụọ abụ,
34Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma,
35Tikuonụ ya mkpu sị, “Zọpụta anyị, gị Chineke, Onye nzọpụta anyị;
36Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel,
37Devid hapụrụ Asaf na ndị Livayị ibe ya nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ ụbọchị niile ije ozi mgbe niile, dịka ọrụ ụbọchị ọbụla si dị.
38Obed-Edọm nwa Jedutun so nʼime ha, ya na Hosa, na iri mmadụ isii na asatọ ọzọ. Obed-Edọm nwa Jedutun na Hosa bụ ndị na-eche ọnụ ụzọ.
39Devid nyefekwara Zadọk, onye nchụaja, na ndị nchụaja ibe ya, ọrụ ịnọ nʼihu ụlọ nzute Onyenwe anyị, nʼebe dị elu nke Gibiọn.
40Nʼihi ịchụ aja nsure ọkụ mgbe niile nʼelu ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, ụtụtụ na anyasị niile nʼusoro dịka e si dee ya nʼakwụkwọ iwu Onyenwe anyị, nke o nyere ndị Izrel.
41Devid họpụtakwara Heman, na Jedutun, na ndị ọzọ a kpọrọ aha họpụta inye Onyenwe anyị ekele, “nʼihi ịhụnanya ya na obi ebere ya nke na-adị ruo mgbe ebighị ebi.”
42Heman na Jedutun bụ ndị ọ dịịrị ịfụ opi, na ịkụ ogene ọla, na ihe egwu ndị ọzọ eji na-enye Chineke otuto. Ụmụ ndị ikom Jedutun bụ ndị nọ nche nʼọnụ ụzọ ama.
43Mgbe mmemme ahụ gwụsịrị, onye ọbụla lara nʼụlọ ya. Devid lakwara ịgọzi ezinaụlọ ya.